Genesis 41:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n'anu-aru-ha; ha we nāta nri n'etiti ubi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị si nʼosimiri Naịl na-apụta. Ehi ndị a buru ibu, maa mma. Ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ. Ha pụtara, bido ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.