Genesis 41:48 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu.