Genesis 42:33 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m'gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n'akam, ma werenu ọka n'ihi oké unwu nke ulo-unu, la:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu.