Genesis 42:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.