Genesis 43:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”