Genesis 44:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ we nye onye bu onye-isi ulo-ya iwu, si, Kpojue akpa ndikom ahu n'ihe-oriri, otú ha puru ibu, tinye kwa ego onye ọ bula n'ọnu akpa-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya.