Genesis 44:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n'ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya.