Genesis 44:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma?