Genesis 45:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ.