Genesis 45:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.