Genesis 6:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n'elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.