Genesis 8:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.