Habakkuk 3:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,