Habakkuk 3:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?