Haggai 1:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.