Haggai 2:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.