Haggai 2:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”