Haggai 2:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.