Haggai 2:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.