Hebrews 1:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọzọ kwa, mgbe Ọkpara ya bụ Jisọs, onye ọ mụrụ nanị ya bịara nꞌụwa, Chineke nyere iwu sị “Ka ndị mmụọ ozi nile fee ya ofufe.”
Igbo 2006
Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”