Hebrews 1:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Chineke kwuru okwu banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị na ha bụ ndị na-eje ozi. Ha dị ka ikuku na-efesi ike. Ha na-agakwa ozi ha nile dị ka ọkụ na-enwusi ike.
Igbo 2006
Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si, Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe, Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”