Hebrews 10:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma iwu ahụ ezipụtaghị ihe nile. Iwu ahụ bụ nanị onyinyo gosiri ihe gaje ịbịa abịa, bụ ihe karịrị ya mma, nꞌihi na o zughị oke nꞌonwe ya. Nꞌihi nke a, iwu ahụ enweghị ike isite nꞌọchụchụ aja nile a na-achụ kwa afọ, ọtụtụ mgbe, mee ka ndị ahụ na-abịakwute Chineke zuo oke.
Igbo 2006
N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke.