Hebrews 10:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na iwu pụrụ ime ihe dị otu a otu ugboro ka a gaara achụ aja. Otu aja ahụ gaara ewepụkwa echiche mmehie ọ bụla nꞌime ndị chụrụ ya.
Igbo 2006
N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha.