Hebrews 10:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ.
Igbo 2006
ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.