Hebrews 10:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, ka anyị were obi nke egwu na-adịghị jidesie nkwupụta olileanya anyị ike. Ka anyị kwupụta nke a na-enweghị obi abụọ. Nꞌihi na Chineke aghaghị imezu nkwa ya. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emezu okwu ya nile.
Igbo 2006
ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.