Hebrews 10:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.