Hebrews 10:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa.
Igbo 2006
ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?