Hebrews 10:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Dị ka ndị maara Chineke na ọ bụ onye okwu ya na-adị dị ka o si kwuo ya, anyị maara na ọ bụ Chineke kwuru sị, “Mụ onwe m nwe ọbọ, mụ onwe m ga-enyeghachikwa.” Ọ bụkwa Chineke kwuru sị, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
Igbo 2006
N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”