Hebrews 10:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu sooro ndị ha tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụkọọ ahụhụ. Mgbe ha na-apụnara unu akụ unu na ihe obibi unu nile unu jiri obi ụtọ nꞌime Onyenwe anyị nara nke a. Nꞌihi na unu maara na unu nwere akụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo 2006
N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.