Hebrews 10:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs kwuru sị, “Lee abịala m Chineke, ime ihe ị chọrọ ka m mee.” Nꞌihi aja Jisọs jiri onwe ya chụọ, Chineke ewepụla ụzọ ịchụ aja ochie ahụ e ji agbaghara mmehie, were ụzọ ọhụrụ nke ọchụchụ aja Kraịst dochie nꞌọnọdụ ya.
Igbo 2006
mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.