Hebrews 11:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Site nꞌotu nwa a Eberaham ghọrọ nna mba dị ukwuu. Ndị mmadụ chere na Eberaham na Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma taa, site nꞌotu nwoke a bụ Eberaham e nwere ụmụ ụmụ ya dị ukwuu dị ka kpakpando eluigwe. Ha dị ukwuu dị ka aja dị nꞌakụkụ osimiri.
Igbo 2006
ọ bu kwa n'ihi nka ka esitere n'otù nwoke mu umu, mb͕e ọ di kwa ka onye nwuru anwu, bú umu bara uba dika kpakpando nke elu-igwe, di kwa ka ájá, nke di n'usọ oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri.