Hebrews 11:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi nke a, ha achọghị ile anya nꞌazụ nꞌihe ụwa ha hapụrụ. Ha gaara alaghachi azụ ịchọ ọganihu ụwa. Ma ha dabeere na-ele anya ngọzi sị nꞌeluigwe nke Chineke na-enye.
Igbo 2006
Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ.