Hebrews 11:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ okwukwe Eberaham nwere nꞌime Chineke mere o ji kwere iwere nwa ya Aizik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa. Eberaham bụ onye Chineke kwere nkwa ma o kwadoro iji nwa ahụ ọ mụrụ nanị ya chụọra Chineke aja.
Igbo 2006
Mb͕e anānwa Abraham, ọ bu okwukwe ka o ji che Aisak n'iru Chineke dika àjà: e, onye ahu nke narari nkwa ahu nke-ọma nēche nwa-nwoke ọ muru nání ya n'iru Chineke dika àjà:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja,