Hebrews 11:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nne na nna Mosisi zipụtara okwukwe mgbe ha mụrụ Mosisi. Ha zoro ya ọnwa atọ nꞌihi na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu nke eze ala Ijipti bụ Fero nyere.
Igbo 2006
Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.