Hebrews 11:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
Igbo 2006
Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma.