Hebrews 11:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebel bụ nwoke nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ọ chụrụ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke nwanne ya Ken chụrụ. Site nꞌokwukwe o nwere nnwapụta Chineke na ọ bụ onye ezi omume. Chineke nabatara Ebel nꞌihi na o nyere onyinye ya site nꞌokwukwe. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na Ebel anwụọlarị, anyị nwere ike ịmụta ihe site na ndụ ya banyere inwe okwukwe nꞌime Chineke.
Igbo 2006
Okwukwe ka Ebel ji che àjà n'iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe.