Hebrews 11:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ.
Igbo 2006
Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.