Hebrews 11:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Noa bụ otu onye nꞌime ndị nwere okwukwe na Chineke. Chineke dọrọ Noa aka na ntị banyere ihe gaje ime. Noa kweere. Ọ bụ ezie na otu mkpụrụ igwe ojii adịghị nꞌeluigwe, ma na-atụfughị mgbe, Noa wuru ụgbọ mmiri o ji zọpụta onwe ya na ndị ezinụlọ ya. Okwukwe Noa adịghị ka nke ndị ọzọ nọ nꞌụwa nꞌoge ahụ. Ya mere, Noa sitere nꞌokwukwe bụrụ onye nketa alaeze Chineke.
Igbo 2006
Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.