Hebrews 11:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Site nꞌokwukwe, Eberaham rubeere Chineke isi. Chineke gwara ya ka ọ hapụ ala ya gaa nꞌala ọzọ dị anya Chineke ga-egosi ya. Ọ bụ nanị ala e kwere na nkwa! Ma Eberaham biliri gaa, ma ọ mataghị ebe ọ na-aga.
Igbo 2006
Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.