Hebrews 12:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka onye ọ bụla hapụ ịdaba na mmehie ịkwa iko. Ka onye ọ bụla hapụ iji Chineke gwurie egwu dị ka Ịsọ mere. Ịsọ bụ onye rere ọnọdụ ọkpara ya nꞌezinụlọ nna ya nꞌihi otu efere nri.
Igbo 2006
ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.