Hebrews 12:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu maara na o mechara chọọ ka nna ya gọzịe ya, ma nna ya agọzighị ya. Nꞌanya mmiri ọ rịọrọ ka a gọzie ya ma ọ nataghị ngọzi ahụ. Nꞌihi na oge agafeela imezi ihe o mibiri na mbụ.
Igbo 2006
N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.