Hebrews 12:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O nwebeghị oge unu gozoro ọtụ nꞌihu ihe na-eyi egwu, na ọkụ na-enwusi ike, na ọchịchịrị na oke ifufe. Ụmụ Izirel hụrụ ihe ndị a nile nꞌugwu Sainai oge Chineke nyere ha iwu ya.
Igbo 2006
N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe,