Hebrews 12:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu abịala nꞌụlọ nzukọ Kraịst ebe ndị nile e dere aha ha nꞌeluigwe na-anọkọ. Unu abịakwutela Chineke onye ga-ekpe mmadụ nile ikpe. Unu abịakwutekwala ndị nile a gbapụtara, bụ ndị nọ nꞌeluigwe. Ndị ahụ e mere ka ha bụrụ ndị zuru oke.
Igbo 2006
bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.