Hebrews 12:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu abịakwutela Jisọs onye e sitere nꞌaka ya mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ. Unu abịakwala nꞌọbara e fesara, nke na-ekwu okwu mgbaghara mmehie. Ọbara a dị mma karịa ọbara Ebel, nꞌihi na ọbara Ebel lere anya ịbọ ọbọ.
Igbo 2006
na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.