Hebrews 12:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere gbalịsienụ ike ịhụ na unu na-erubere Chineke isi. Chineke tara ụmụ Izirel ahụhụ nꞌihi na ha nupụrụ isi nꞌebe Mosisi nọ. Ọ ga-atakwa anyị ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị. Nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya si nꞌelu na-agwa anyị okwu.
Igbo 2006
Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.