Hebrews 12:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.
Igbo 2006
Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.