Hebrews 13:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”
Igbo 2006
Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”