Hebrews 13:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu site nꞌịgbaso ezi ụzọ ahụ. Ọ dị mma ka e site nꞌamara mee ka mkpụrụ obi anyị bụrụ ihe dị ike, ọ bụghị site nꞌidebe iwu ụfọdụ e nwere maka iri nri. Ndị na-edebe iwu ndị a enweghị inye aka ọ bụla site na ya.
Igbo 2006
Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.