Hebrews 2:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta.
Igbo 2006
N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.