Hebrews 2:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya.
Igbo 2006
N'ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n'otù Nna: ọ bu kwa n'ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.